2 Samuel 19

Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”

2 Samuel 19:21 (UKJV) But Abishai the son of Zeruiah answered and said, Shall not Shimei be put to death for this, because he cursed the LORD's anointed?

19sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya,

20nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.”

21Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”

22Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”

23Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.