2 Samuel 19

Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.”

2 Samuel 19:23 (UKJV) Therefore the king said unto Shimei, You shall not die. And the king swore unto him.

21Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”

22Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”

23Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.”

24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.

25Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.