30Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.”
31Bazilai onye Gilead sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ.
32Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
33Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.”
34Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem?