31Bazilai onye Gilead sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ.
32Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
33Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.”
34Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem?
35Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze?