2 Samuel 19

Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!”

2 Samuel 19:4 (UKJV) But the king covered his face, and the king cried with a loud voice, O my son Absalom, O Absalom, my son, my son!

2Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ.

3Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha.

4Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!”

5Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ.

6Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.