2 Samuel 19

Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?”

2 Samuel 19:42 (UKJV) And all the men of Judah answered the men of Israel, Because the king is near of kin to us: wherefore then be all of you angry for this matter? have we eaten at all of the king's cost? or has he given us any gift?

40Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.

41Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?”

42Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?”

43Ma ndị ikom Izrel zara sị, “Anyị dị ebo iri nʼIzrel, nʼihi ya, anyị nwere oke iri nʼime Devid karịa unu. Gịnị mere unu ji lelịa anyị anya? Chetakwanụ na ọ bụ anyị bu ụzọ kwuo okwu maka nlọta ya ịbụ eze anyị ọzọ.” Ma ndị ikom Juda ejighị olu ọma nye ndị Izrel ọsịsa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.