2 Samuel 19

Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.

2 Samuel 19:40 (UKJV) Then the king went on to Gilgal, and Chimham went on with him: and all the people of Judah conducted the king, and also half the people of Israel.

38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.”

39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.

40Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.

41Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?”

42Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.