2 Samuel 19

Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.”

2 Samuel 19:38 (UKJV) And the king answered, Chimham shall go over with me, and I will do to him that which shall seem good unto you: and whatsoever you shall require of me, that will I do for you.

36Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche.

37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”

38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.”

39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.

40Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.