35Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze?
36Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche.
37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”
38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.”
39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.