1Dịka oge na-aga, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?” Onyenwe anyị sịrị, “Gbagoo.” Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?” Onyenwe anyị zara, “Hebrọn.”
2Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ.
3Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu.