2 Samuel 2

Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.

2 Samuel 2:21 (UKJV) And Abner said to him, Turn you aside to your right hand or to your left, and lay you hold on one of the young men, and take you his armour. But Asahel would not turn aside from following of him.

19Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ.

20Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”

21Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.

22Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?”

23Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.