2 Samuel 2

Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”

2 Samuel 2:26 (UKJV) Then Abner called to Joab, and said, Shall the sword devour for ever? know you not that it will be bitterness in the latter end? how long shall it be then, before you bid the people return from following their brethren?

24Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn.

25Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha.

26Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”

27Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”

28Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.