30Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha.
31Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.
32Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.