2 Samuel 2

Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”

2 Samuel 2:7 (UKJV) Therefore now let your hands be strengthened, and be all of you valiant: for your master Saul is dead, and also the house of Judah have anointed me king over them.

5o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi.

6Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere.

7Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”

8Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim.

9Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.