2 Samuel 21

Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.

2 Samuel 21:14 (UKJV) And the bones of Saul and Jonathan his son buried they in the country of Benjamin in Zelah, in the tomb of Kish his father: and they performed all that the king commanded. And after that God was implored for the land.

12ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa.

13Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.

14Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.

15Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.

16Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.