13Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.
14Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
15Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.
16Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.
17Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”