17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
21“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.