46Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
47“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.