2 Samuel 23

“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.

2 Samuel 23:2 (UKJV) The Spirit of the LORD spoke by me, and his word was in my tongue.

1Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.

2“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.

3Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.

4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.