3Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
5“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
6Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
7Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”