2 Samuel 3

Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.

2 Samuel 3:32 (UKJV) And they buried Abner in Hebron: and the king lifted up his voice, and wept at the grave of Abner; and all the people wept.

30Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.

31Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ.

32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.

33Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?

34E kekwaghị aka gị abụọ ihe. E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.