2 Samuel 3

Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.

2 Samuel 3:30 (UKJV) So Joab, and Abishai his brother slew Abner, because he had slain their brother Asahel at Gibeon in the battle.

28Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu Onyenwe anyị banyere ọbara Abna, nwa Nea.

29Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”

30Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.

31Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ.

32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.