36Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ.
37Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea.
38Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa?
39Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”