2 Samuel 5

Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.

2 Samuel 5:1 (UKJV) Then came all the tribes of Israel to David unto Hebron, and spoke, saying, Behold, we are your bone and your flesh.

1Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.

2Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”

3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.