2 Samuel 5

Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.

2 Samuel 5:3 (UKJV) So all the elders of Israel came to the king to Hebron; and king David made a league with them in Hebron before the LORD: and they anointed David king over Israel.

1Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.

2Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”

3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.

4Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ.

5Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.