18Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.
19Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
20Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.
21Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
22Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.