9Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
10O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
12Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
13Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.