2 Samuel 6

Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

2 Samuel 6:18 (UKJV) And as soon as David had made an end of offering burnt offerings and peace offerings, he blessed the people in the name of the LORD of hosts.

16Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.

17Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.

18Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

19O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.

20Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.