21Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
22E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
23Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.