2 Samuel 7

I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.

2 Samuel 7:24 (UKJV) For you have confirmed to yourself your people Israel to be a people unto you for ever: and you, LORD, are become their God.

22“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.

23Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?

24I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.

25“Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị

26Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.