11Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.
12Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
13Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.
14Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
15Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu.