2 Ndị Tesalonaịka 2

Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.

2 Thessalonians 2:12 (UKJV) That they all might be damned who believed not the truth, but had pleasure in unrighteousness.

10Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta.

11Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.

12Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.

13Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.

14Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.