9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.
10Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.
11Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
12Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
13Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.