11Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
12Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
13Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.
14Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.
15Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.