2 Timoti 1

Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.

2 Timothy 1:16 (UKJV) The Lord give mercy unto the house of Onesiphorus; for he often refreshed me, and was not ashamed of my chain:

14Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.

15Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.

16Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.

17Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m.

18Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.