14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.
15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
16Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa.
17Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
18Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala.