8Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị.
9Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
10Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m,
11na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.
12Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.