9Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
10Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m,
11na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.
12Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.
13Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.