9Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
10Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.
11Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
13Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.