9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.
10Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.
11Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala.
12Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe.
13Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.”