Ọrụ Ndị Ozi 10

Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.

Acts 10:9 (UKJV) On the next day, as they went on their journey, and drew nigh unto the city, Peter went up upon the housetop to pray about the sixth hour:

7Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke.

8Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.

9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.

10Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.

11Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.