Ọrụ Ndị Ozi 10

Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.

Acts 10:25 (UKJV) And as Peter was coming in, Cornelius met him, and fell down at his feet, and worshipped him.

23Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.

24Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ.

25Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.

26Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”

27Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.