25Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.
26Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”
27Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara.
28Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha.
29Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”