34Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu.
35Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
36Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
37Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya.
38Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.