33Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
34Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu.
35Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
36Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
37Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya.