Ọrụ Ndị Ozi 10

Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ,

Acts 10:46 (UKJV) For they heard them speak with tongues, and magnify God. Then answered Peter,

44Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a.

45Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.

46Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ,

47“Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?”

48Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.