25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl.
26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.
27Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk.
28Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị.
29Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike.