5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m.
6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe.
7Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’
8“Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’
9“Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’