6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe.
7Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’
8“Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’
9“Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’
10Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.