20Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.
21Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu.
22Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!”
23Nʼotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti dị egwu nʼihi na o nyeghị Chineke otuto ma otu. Ikpuru ripịara ya ahụ, nke mere ka ọ nwụọ.
24Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa.